The Preliminary ODEZURUIGBO vol 5: preliminary ODEZURUIGBO vol 5
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
ISSN 2672-4243
Authors
- Dr. George Onwudiwe Corresponding author
- Dr. Gladys Udechukwu
- Dr. Christian E. C. Ogwudile
Abstract
Nkọwa Jonal Odezuruigbo Odezuruigbo bụ Jonal nke Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afirika na Nzikọrịta Ozi, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Aha a bụ okwu Igbo nke pụtara “Ihe jezuru ebe niile”. Ude ya na-edezu na mba niile site na Gọọgụl na Ntaneetị. Nke a mere na Jonal a, dị ka aha ya gosipụtara, metụtara mmadụ niile na mba niile. Ebumnuche Jonal Odezuruigbo hiwere isi n’ime ka a mara na ọ dị mkpa iji asụsụ Igbo depụta edemede nchọcha enyochara nke ọma. Nke a ga-enye aka n’ịkwalite asụsụ Igbo, ma mee ka ọ na-eto eto. Ọ na-anabatakwa edemede e dere na Bekee nke nakwa ewelite ogo asụsụ, omenala, amamihe, nsirihụ ụwa na njirimara ndị Igbo. Nke a pụtara na ọ na-anabata edemede na atụmatụ ọbụla metụtara ọdịmma ndị mmadụ, akụkọ ntọala, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, agụmagụ, ekpemekpe, omenala, agụmakwụkwọ, ọchịchị, nka na ụzụ, w.d.g. Edemede na-adị n’Odezuruigbo nwere ike bụrụ edemede mmekọrịta zuru ụwa ọnụ, nke mmụta si na ya ga-ewulite asụsụ Igbo. Ọ nwekwara ike bụrụ nke si mba Eshia na Afrịka kpọmkwem, nke asụsụ Igbo ga-esi na ya nwee mmụta na mbawanye amamihe. Onye amaghị, ibe ezi ya. Edemede nchọcha a na-anabata n’Odezuruigbo bụ nke a kpachapụrụ anya, pịa aka, lebamie ha anya n’ime, weteruo ha n’ogo edemede otu mmụta n’ụwa dum na-eṅomi. Edemede ndị agafeghị n’anya agịga nnyocha, a ga-ezighachiri ha ndịdere ha. Mmebere edemede Odezuruigbo nwere ike ịdị ọtụtụ. Nke a na-egosi ụdị mmasịna ntụkwasị obi ndị odee nwere na ya. N’otu aka ahụ, okwu ọbụla na atụmaro ọ bụla e bipụtara n’Odezuruigbo bụkwa nke ndị dere ha. Ọ bụghị nke Onye isi nhazi ma ọ bụ Onye mbipụta. Ọrụ Onye isi nhazi jedebere n’ịhazi edemede. A na-ebipụta Jonal Odezuruigbo kwa afọ, tụmadị ugboro abụọ n’afọ.Onye isi Ngalaba/Onye Nhazi