MWEPỤ N’OLU ỌKA SITE N’USORO ỤTỌASỤSỤ NNWOGHARỊ
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
ISSN 2672-4243
Authors
- Chiamaka Helen Akabogu Corresponding author
- Christian E. C. Ogwudile (PhD)
Abstract
Ụmị edemedeNchọcha a nke isiokwu ya bụ “Mwepụ n’olu Ọka site n’usoro ụtọasụsụ Nnwogharị” bụ nke lebara anya n’ụdị mwepụ dị iche iche na-apụta n’olu Ọka. Ihe kpalitere mmụọ nwa nchọcha ileba anya n’isiokwu a bụ na e nwebeghi ọtụtụ nchọcha e merela n’isiokwu a mbụ. Ebumnobi nchọcha a bụ iji lebaa anya ma tụpụta ụdị mgbanwe dị iche iche na-adapụta n’olu Ọka site n’iji usoro ụtọasụsụ nnwogharị wee nyochaa ya. Ọzọ bụ ịchọpụta ka olu Ọka si ahazi mkpụrụokwu na ndokọ okwu, ọ kachasị mgbe ọ na-ezipụta mwepụ mkpụrụasụsụ, mkpụrụokwu ma ọ bụ nkebiokwu. Nchọcha a bụ nchọcha kesọvee, a gbasokwara usoro Atụtụ ỤtọasụsụNnwogharị wee mee ya. Site na nchọcha a, a chọpụtara na mgbanwe pụtara n’olu Ọka dị ka o si pụta n’olu Izugbe. A chọpụtakwara na ụfọdụ irighiri okwu dị na ndokọ omimi na-apụ na ndokọ elu nke ahịrịokwu n’ihi nnwogharị nke ahịrịokwu ahụ gabigara. Nchọcha a ga-abara ọtụtụ ndị uru, ọ kachasị ndị amụmamụ ụtọasụsụ Igbo. Nwa nchọcha na-atụkwazị aro ka e were usoro ụtọasụsụ nnwogharị lebakwuo anya n’olu asụsụ Igbo dị iche iche iji bawanye ngwa ọmụmụ asụsụ Igbo.