TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

ODEZURUIGBO JOURNAL

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed ISSN: 2672-4243
Research article open Vol. 4 No. 1 (2020)

MKPỤRỤỤDAASỤSỤ NA MKPỤRỤASỤSỤ: MYIRI HA NA MKPA HA DỊ N’ASỤSỤ IGBO

Ngozi Anyaku Kanu · Pages 16-30 · August 14, 2020

ISSN 2672-4243

Authors

  • Ngozi Anyaku Kanu Corresponding author

Abstract

Ọtụtụ ndị mmadụ ji asụsụ eme ihe, mana ọ bụghị ọtụtụ n’ime ha maara maka ihe ndị na-emebe asụsụ. Ihe ndị na-emebe asụsụ anyị na-asụ asụ na-esite na mkpụrụụdaasụsụ nakwa mkpụrụasụsụ. Ha abụọ si n’amụmamụ Lingwistiiks n’alaka ọdịdị ụda asụsụ na mmebe okwu. N’imebe okwu ka ha abụọ na-adị mkpa, site na mmekọrịta dị n’etiti ha. Mana ọ bụghị onye ọ bụla maara ụdị mmekọrịta dị n’etiti ha nke na-emepụta asụsụ anyị na-ahụ anya. Ọ bụghịkwanụ imerime mmadụ maara ụdị mkpa mkpụrụụdaasụsụ na mkpụrụasụsụ dị n’asụsụ Igbo. Ọ bụ ya kpatara anyị jiri chọọ ime nchọcha n’isiokwu a bụ “Mkpụrụụdaasụsụ na Mkpụrụasụsụ: Myiri ha na mkpa ha dị n’asụsụ Igbo”. Ebumnuche anyị ji maka ya eme nchọcha a dị anọ. Nke mbụ bụ ịkọwa ihe bụ mkpụrụụdaasụsụ. Nke abụọ bụ ikọwa ihe bụ mkpụrụasụsụ. Nke atọ bụ izipụta myiri dị na mkpụrụụdaasụsụ na mkpụrụasụsụ. Nke anọ ma bụrụ nke ikpeazụ bụ ịkọwa mkpa ma ọ bụ uru mkpụrụụdaasụsụ na mkpụrụasụsụ bara n’asụsụ Igbo. Usoro anyị ji eme nchọcha a bụ usoro nkọwa. Atụtụ anyị ji mee nchọcha a bụ atụtụ Nkọwa ụtọasụsụ (descriptive grammar theory). Anyị chọpụtara na ọ bụ site na mkpụrụụdaasụsụ ka e si enweta mkpụrụasụsụ. Ya mere nchọcha a ga- abụ enyemaaka nye ndị nkụzi, ụmụakwụkwọ, ndị odee akwụkwọ Igbo na ndị ọzọ nwere mmasị n’asusụ.

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (Kanu, 2020) · Kanu (2020)