TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

ODEZURUIGBO JOURNAL

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed ISSN: 2672-4243
Research article open Vol. 4 No. 1 (2020)

AMỤMAMỤ 6-3-3-4 NA ỌNỌDỤ ASỤSỤ N’ỤLỌ AKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ

Peace Ebere Udensi, Joy Ifeadikanwa Obayi · Pages 1-15 · August 14, 2020

ISSN 2672-4243

Authors

  • Peace Ebere Udensi Corresponding author
  • Joy Ifeadikanwa Obayi

Abstract

Asụsụ Igbo bụ asụsụ agaghị  ahapụ ahapụ n’obodo Naijịrịa. Nchọcha a lebara anya na “Amụmamụ 6-3-3-4 Na Ọnọdụ Asụsụ n’Ụlọ Akwụkwọ Sekọndịrị”. Amụmamụ 6-3-3-4 bụ usoro ewepụtara nke na-achịkwa usoro ọmụmụ na obodo Naijịrịa, nke gụnyere ịgụ primari afọ isii, gaa sekọndịrị nta afọ atọ, gụọ sekọndịrị ukwu afọ atọ ma gakwa mahadum gụọ afọ anọ. Usoro ọmụmụ a kwesịrị ka a na-agbaso ya dị ka o kwesịrị. Mbunuche ndị nchọcha bụ ịchọpụta ka e si agbaso usoro amụmamụ a bụ 6-3-3-4 n’Aba, Abia steeti, iji mee ka amụmamụ asụsụ Igbo gaa n’ihu dị ka o kwesiri. Ọ ga-achọkwa ịmata ebe anaghị eme nke ọma nakwa usoro ka mma iji kụzie asụsụ ọkachasị n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. A na-ahụta na, ọmụmụ asụsụ Igbo anaghị aga n’ihu dị ka o kwesịrị n’ihi na ụfọdụ ụlọ akwụkwọ anaghị akụzi asụsụ n’ụlọ akwụkwọ ha ebe ndị nke na-akụzi ya, enweghị ndị nkụzi tozuru oke, nakwa ngwa nkụzi zuru oke maka nkụzi asụsụ. Ọzọ, ụfọdụ ndị nkụzi asụsụ Igbo anaghị agbaso ihe ndị e depụtara na kọrịkụlụm maka nkụzi. Nke a mere n’ọtụtụ ụmụ akwụkwọ sekọndịrị anaghị enwe ike ịsụ ma ọ bụ dee asụsụ Igbo. Ọ bụ nsogbu ndị a kpaliri mmụọ ndị nchọcha ime nchọcha a, iji chọpụta ụzọ e nwere ike iji mee ka ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị gaa n’ihu dịka o kwesiri. Usoro a gbasoro wee nweta njatule e ji mee nchọcha a bụ site na njụmaza. Ndị nchọcha ji ndị nkụzi 83 nọ n’ụlọakwụkwọ 26 dị n’Aba, Abia steeti mee nchọcha a. Site na nchọcha a, ndị nchọcha chọpụtara na ndị nkụzi ụfọdụ anaghị eme ihe ha kwesịrị ime n’ihi na ha na-ahapụikụzi ihe dị na kọrịkụlụm ma họro naanị ndị diiri ha mfe. Nchọcha a bunyekwara uche ihe ga-eme ka amụmamụ a gaa n’ihu dị ka ndịa: O kwesiri ka gọọmenti Abia steeti na gọọmenti etiti, bụ ndị na-ahụ maka mmụta gbaa mbọ ihụ na a na-akụzi ihe ndị dị na kọrịkụlụm dị ka o kwesiri site n’ime nnyocha ndị nkụzi na akọrọngwa nkụzi. Ndị gọọmenti ga-agba mbọ ikwalite ụlọ akwụkwọ site n’ime ka ha nweta akọrongwa na ngwa nkụzi ha chọrọ nke ga-eme ka nkụzi na-aga n’ihu dị ka o kwesịrị.

Keywords

Asụsụ Igbo, Amụmamụ asụsụ Igbo, Amụmamụ 6-3-3-4

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (Udensi & Obayi, 2020) · Udensi and Obayi (2020)