ERIMJI ỌHỤRỤ: OMENALA NDỊ IGBO
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
Authors
- PhD Ikechukwu Okodo Corresponding author
Abstract
Ụmị EdemedeOmenala agbụrụ ọbụla bụ ihe e ji mara ha. Mpekele omenala ọbụla na-adị ụbara. Erimjiọhụrụ bụ otu mpekele omenala e ji mara ndị Igbo malite n‘oge gboo rue ugbua. Ọtụtụmmadụ na-eleghara omenala anya n‘ụdị na ọ bụ ihe ndị ọgọ mmụọ nke na-emetụta mpekeleomenala a. Ọtụtụ amaghị uru ya. Usoro nchọcha a gbadoro ụkwụ na nkọwadaru ala. Enwetara ngwa nchọcha n‘ọba akwụkwọ. Nwanchọcha si n‘ọba akwụkwọ weta ngwanchọcha ya. A chọpụtara na ji bụ eze akụkụ ndị ọzọ, nwere arụsị na-elekọta ya anya. Arụsịahụ bụ Ifejiọkụ nke nwere mgbanwe n‘aha ya site n‘otu ebe ruo n‘ebe ọzọ. Nchọcha a gaaba ọtụtụ uru. Uru ndị ahụ gụnyere na ndị mmadụ ga-amata ọkpụrụkpụ omenala ndị Igbo abụ erimji ọhụrụ, mata ka o si enye aka n‘agụmarọ, ịkpọkọta ndị mmadụ ọnụ n‘otu oge ka hamara ibe ha n‘otu n‘otu, ekpere na achụmaja iji yọta isiọma n‘aka Chineke wdg.