ARỤMỌRỤ JI N’ALA NGWA: NTỤLE NKE UGBU A NA NKE GBOO
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
Authors
- Ph.D. Chinenye C. Olekaibe Corresponding author
- Ph.D. Basilica N. Eweoma
- Andrew C. Mgborogwu
Abstract
Ụmị EdemedeJi bụ otu n‘ime ihe gbara ọkpụrụkpụ a na-akọpụta n‘ọrụ ubi e ji mara ndị Ngwa. Ndị Ngwana-akọpụta ji ebe ọ na-ada ụda mere ha ji hiwe emume ichi Ezeji iji sọpụrụ ma kwanyereụmụ nwoke na-arụpụtakarịcha ji n‘ala ha ugwu. Ndị Ezeji n‘ala Ngwa na-enwe ọba ji bụanya bịa lere iji wee tozuo ituru ugo a n‘ihi na ọ bụ ọkwa e ji ama ndị bụ dimkpa naọgaranya n‘oge mgbe ochie. Mana ka ọ dị taa, ọnọdụ a agbanweela. Ji dị iche iche e ji marandị Ngwa bụzị ihe anya anazịghị ahụ n‘ihi enwezịghị ndị na-arụ ha. Ọnọdụ a ji nọ n‘alaNgwa ugbu a bụ ihe kpaliri mmụọ ndị odee mere ha ji chọ itule ọnọdụ arụmọọrụ ji n‘alaNgwa, nke ugbu a na nke gboo. Nchọcha a chọpụtara na ala Ngwa bụ oke mba e ji ịrụpụta jiebe ọ dị ukwuu wee mara n‘oge gboo, na e nwere ụdị ji dị iche iche e ji mara ha, na ha naakwanyere ndị kacha arụpụta ji ugwu site n‘ichi ha Ezeji, na ha na-eme iri ji ọhụrụ iji nabataji ọhụrụ n‘ala ha nakwa ọtụtụ nsọ ha nweere ji. Ka ọ dị taa ha chọpụtakwara na ọnọdụnrụpụta ji n‘ala Ngwa alaala azụ. Ha nyere ndụmọọdụ ka ndị Ngwa gbalịa laghachi azụn‘ejirimara ha na ọ ga-enye aka ịkwalite ụzọ obibi ndụ ha. Ndị nchọcha ji ajụjụ ọnụ ha gbarana ihe ndị ha nwetara n‘ọbaakwụkwọ mere ihe.